Dora Akunyili

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dora Akunyili
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoNkem Dezie
Aha enyereDora Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Julaị 1954 Dezie
Ebe ọmụmụMakurdi Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya7 Jụn 2014 Dezie
Ebe ọ nwụrụNdia Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
ihe kpatara ọnwụovarian cancer Dezie
Ebe oliliAgulu Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Ọrụ ọ na-arụpharmacologist, university teacher Dezie
onye were ọrụMahadum nke Nigeria, National Agency for Food and Drug Administration and Control, Nigerian Federal Ministry of Information and Communications Dezie
Ọkwá o jiMinister of Information and Communications, Minister of Information and Communications Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Grand Alliance Dezie
Ihe nriteIntegrity Award, Order of the Federal Republic Dezie

Dora Nkem Akunyili (A mụrụ ya n'ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa nke asaa n'afọ̀ 1954. Ya anwụọ n'ụbọchị nke asaa n'ọnwa nke isii n'afọ̀ 2014). Ọ bụbu nnukwu onyeisi ntụziaka (nke a na-akpọ daịrekụtọ jenaralụ n'asụsụ Bekee) n'ụlọ-ọru NAFDAC na-ahụ na a na-emepụta nakwa na-ekekesa ọgwụ, ihe ọńụńụ na ihe oriri n'ụdị kwesịrị ekwesị. Akunyili bụkwara mịnịsịta hụrụ maka mgbasa ozi n'ala Naịjiria site na-afọ̀ 2008 ruo 2010. Ọ bụ onye maara ka esi emepụta ọgwụ, onye ndi Bekee na-akpọ famasisiti, nakwa onye ọrụ gọọmentị amà ama na mbà ụwa. O nwetara ọtụtụ onyinye maka ezigbo ọrụ ya site n'aka ndị 'pharmacology', 'public health' na 'human rights' doro anya.[Tinye edensibịa]

Akunyili dọrọ ndọrọ-ndọrọ ịbụ onye omebe iwu dịka sinetọ n'ụlọ ọgbakọ ndị omebe iwu Naịjiria na-anọchite anya andị Anambra Central n'okpuru APGA n'ọnwa nke anọ n'afọ̀ 2011, mana  Chris Ngige nke ACN meriri ya. Ozugbo, o zigaara ndị Independent National Electoral Commission akwụkwọ ịgbagha ndapụta ndọrọ-ndọrọ ahụ̀.[1] N'ụbọchị nke asaa nọnwa nke isii n'afọ̀ 2014 ka Akunyili nwụrụ n'ụlọ ọgwụ nọ n'India, site n'ọrìa kansa.[2]

Ọchichi ya na NAFDAC[dezie | dezie ebe o si]

Na nsote nghoputa ya dika onye Ntuziaka ofis ndi NAFDAC nile n'onwa ano na-afo 2001, Akunyili mere ya ihe di mkpa ikpochapụ ọgwụ ndi na-adighi mma 'counterfeit drugs' na nri ndi n'adighi mma n'ahụ 'unsafe food'.[3]  Tupu ya arigoro n'ọkwa ya na NAFDAC, ogwu na nri adịgboroja juru n'ala Naijiria n'enweghi onye mezi ya. O wutere ya nke nnukwu na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyi obodo ya na-aṅụ ọgwụ adịgboroja yiri nke bụ ezi ya maka oria iba 'malaria' na 'tuberculosis' ."[4] Na-agbanyeghi na enwere ọtụtuihe ize ndụ na mkpebi ya ikpochapụ ogwu adịgboroja, otinyere ndụ ya n'ọgwụ. Tinyere n'onwetara ọtụtu ihe inwe na mba ụwa."[5]

Professor (Odoziaku.) Dora Nkem Akunyili, onye rigoro n'ọkwa na-abali 12 n'ọnwa anọ na -afọ dika onye Ntụziaka ndi National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC), bụ 'Pharmacist', 'Pharmacologist', 'Erudite Scholar', Seasoned Administrator', nakwa 'visionary leader'. Ọ bụkwara 'Senior Lecturer na Consultant Pharmacologist' na College of Medicine, University of Nigeria, Nsukka (UNN), Enugu Campus, tupu Ọ bụrụ onye isi ndi NAFDAC.

A mụrụ ya na Makurdi, Benue State, mana otoro na Nanka alụọ ya n'Agulu, ha abụọ di na Anambra State nke Naijiria. Agụm Akwụkwọ ya bidoro mgbe ọgafere ule 'First School Leaving Certificate' nweta Distinction na St. Patrick's Primary School, Isuofia, Anambra State na-afo 1966, na West African School Certificate (WASC) with Grade I Distinction na-afo 1973 na 'Queen of the Rosary Secondary School, Nsukka', nke di na mba Naijiria.

Mpụta asambodo First School Leaving Certificate na WASC mere ya enweta agụm akwụkwọ n'efu nke 'Eastern Nigerian Government Post Primary Scholarship' na 'Federal Government of Nigeria Undergraduate Scholarship'. O nwetara Digirii nke mbụ ya na Pharmacy B.Pharm (Hons) na-afọ 1978 na PhD ya na-afọ 1985 na UNN. Professor Akunyili bụ Post-Doctorate Fellow nke ndi 'University of London' nakwa 'Fellow nke West African Post-Graduate College of Pharmacists'. I ji kwadebe ya maka ọkwa nlekọta ya, enyere ya nkwado Computer Education Programme nke WHO/UNDP/World Bank kwadoro nakwa Senior Management skills Course in RIPA, London, n'afọ 1994 na 1998. Akunyili nwetara ọtụtụ nkwado n'efu.

Akunyili bidoro Ọrụ ya dika onye mmepụta ọgwụ n'afọ 1978 rute 1981, na University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH), Enugu, Tupu ya agawa n'ogba Agụmakwụkwọ dika Graduate Assistant (Research Fellow) na Faculty of Pharmaceutical Sciences, UNN site na 1982 ruo 1986. N'usoro ndi Mahadum, onwere ọtụtụ ọganihu site na Lecturer I na 1986 tupu emee ya Senior Lecturer na 1990. Ezigara ya College of Medicine, UNN na 1992, ebe emere ya Consultant Pharmacologist na 1996, ọkwa ọnọro ruo abali iri abụọ n'ọnwa anọ n'afọ 2001. N'ihi  ịhụnanya ya n'ebe ndi eto-eto di, ọ bụkwara onye nkụzi ọkara oge na West African Postgraduate College of Pharmacists Lagos, Nigeria na-afọ 1992–1995.

A kwadoro Akunyili maka ọkwa ndụti ya na NAFDAC site na ọrụ afọ anọ ya dika onye ode-akwụkwọ na Petroleum Special Trust Fund (PTF), na ahazi ọrụ na steeti ise ndi di n'ọwụwa anyanwụ na-ala Naijiria (Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo States).

Ọrụkwara dika onye Nlekọta na Ọrụ Ubi nakwa otu onye ndi Caretaker Committee nke Local Government, Anaocha Local Government Area di na Anambra State site 1994 ruo1996.Site na 1992 ruo 1994, Akunyili rụrụ dika otu onye State's Hospitals Management Board nakwa State Advisory Council for Women Commission nke di na Anambra State of Nigeria.

Dika ọkà mmụta sayensị, owepụtara karia Akwụkwọ Research 20 n'ọtụtụ Local and International Scientific Conferences, tinyekwara ibipụta otu akwụkwọ na ihe edide 18. O lekọtara ndi Ogo Doktorate na Masters na Nnamdi Azikiwe University Awka na U.N.N. nke di na Naijiria. Ọbụna dị ka onye Ntuziaka ndi NAFDAC, Dr. Akunyili wepụtara oge ilekota ndi ụmụakwụkwọ postgraduate na College of Medicine UNN. Ọ bụkwa Chief Examiner in Pharmacology ndi 3rd M.B.B.S College of Medicine, Abia State University Uturu, Naijiria.

Akunyili bụkwara ọtụ onye ndi Pharmaceutical Society of Nigeria (PSN) ebe ọrụrụ dika:

  • PSN Education Committee as Secretary, 1994–2000
  • Organizing Committee for Enugu State PSN Annual Conference as Secretary, 1995
  • Nigerian Association of Academic Pharmacists as National Asst. Secretary, 1990–94
  • Association of Lady Pharmacists as National Vice-President, 1992–95, National Ex Officio Member 1995–2000 and President of Enugu State branch, 1992–98.

Ọ bụkwara otu onye ndi okachamara ndi ọzọ di na Naijiria dika: Nigerian Society for Pharmacology, West African Society for Pharmacology, International Union of Pharmacology na International Pharmaceutical Federation.

Akunyili nwekara ọtụtụ okwa na University of Nigeria Nsukka Senate dika: 

  • Senate Careers Board Committee – Member 1986–93
  • Board of Institute for Development Studies-Member, 1986–93
  • Senate Representative for Faculty of Pharmaceutical Sciences, 1990–92
  • Staff Welfare Committee for Academic Staff Union of Universities, Nigeria – Member, 1991–93
  • Investigation Committee on Alleged Examination Malpractice in Drama 202 Re: Ugwuja C., 86/49917 of Sub-Department Dramatic Arts, UNN – Secretary, 1991–92.

Akunyili’s high sense of responsibility led to her being made a member of the following Faculty of Pharmaceutical Sciences Committees (UNN), 1986–92:

  • Medicinal Plant Committee
  • Examination Committee
  • Continuing Education Committee
  • Publications and Colloquial Committee
  • Committee on Specialization Courses for Pharmacists
  • Consultancy Management Board.

Akunyili bụkwa onye ụka Katọlik nke di ya bụ Dr J. C. Akunyili, of the University of Nigeria Teaching Hospital, Enugu ruo ọnwụ ya. Ha nwere ụmụ isii.

Omume ntụrụndụ ya bụ igụ akwụkwọ nakwa ide akwụkwọ. Ndi oke isi si mba di iche iche nke tinyere Onye isi-ala Goodluck Jonathan na onye isi-ala nke gara-aga General Yakubu Gowon biara Olili ya nke emere n'abali iri abụọ n'asaa na iri abụọ n'asatọ.

Akunyili was laid to rest at Agulu in Anambra state.[6]

Inwe ya[dezie | dezie ebe o si]

Ụfọdụ inwe ndi Prof. Akunyili nwetara na ndụ ya bụ:

  • Time Magazine Award 2006 ("One of the eighteen heroes of our time"), Time Magazine Inc.
  • Person of the Year 2005 Award – Silverbird Communications Ltd, Lagos, 5 January 2006
  • Award of Excellence – Integrated World Services (IWS), Decemb2005
  • Award of Excellence – Advocacy for Democracy Dividends International, Lagos, 17 December 2005
  • Meritorious Award 2005 – St. Michael's Military Catholic Church, Apapa, Lagos, 4 December 2005
  • African Virtuous and Entrepreneurial Women Merit Award 2005 – African Biographical Network, Dec. 2005
  • Award for the Best Government Parastatal – National Association of Nigerian Students (NANS), December 2005
  • An Icon of Excellence Award – The African Cultural Institute and Zenith Bank Plc,[7] 8 December 2005
  • 2005 Grassroots Human Rights Campaigner Award London-based Human Rights Defense Organization, 8 December 2005
  • Most Innovative Director Award Federal Government College, Ijanikin, Lagos, October 2005.[8]
  • Integrity Award 2003 – Transparency International.[9]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Onu, Nwanosike. "How Ngige floored Akunyili in Anambra Central", The Nation, 28 April 2011. Retrieved on 27 April 2011.
  2. "Dora Akunyili, former NAFDAC DG dies at 59", The Sun. Retrieved on 7 June 2014.
  3. Account Suspended. Kwenu.com. Retrieved on 24 January 2014.
  4. Frenkiel, Olenka (12 July 2005). Programmes | This World | One woman's war with fake drugs. BBC News. Retrieved on 24 January 2014.
  5. Dora Akunyili and the dungeon of danger. Web.archive.org. Archived from the original on 7 May 2006. Retrieved on 24 January 2014.
  6. "Prof Akunyili’s final journey home: Day Agulu people, other Nigerians were united in grief", The Sun, 3 September 2014.
  7. zenithbank.com. zenithbank.com (31 December 2012). Retrieved on 24 January 2014.
  8. Nafdacnigeria.org. Nafdacnigeria.org. Archived from the original on 30 June 2007. Retrieved on 24 January 2014.
  9. [1] Àtụ:Webarchive

Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]