Carl Abrahams

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Carl Myrie Abrahams OD (14 Mee 1911 - 10 Eprel 2005) bụ onye na-ese ihe Ndị Jamaica si Saint Andrew Parish.

Akụkọ ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Abrahams na St Andrew, Jamaica n'ezinụlọ nọ n'ọkwá dị n'etiti.[1] Ọ malitere ọrụ ya na nka azụmahịa mgbe ọ dị afọ iri na asaa dị ka onye na-ese ihe nkiri na onye na-egosi ihe osise maka The Daily Gleaner na Jamaica Times yana ịmepụta mgbasa ozi maka Myers Rum na Jamaica Biscuit Company.[1][1]

N'afọ 1937, mgbe ọ nọ ezumike na-arụ ọrụ na Jamaica, Augustus John, onye na-ese ihe na Britain, gbara Abrahams ume ịmalite ise ihe n'ụzọ ọkachamara. Abrahams kụziiri onwe ya ise ihe site na nkuzi onwe onye na akwụkwọ ntuziaka na site na iṅomi ọrụ nka site na akwụkwọ nka.

Ọzo kwa, N'afọ 1944, n'oge Agha Ụwa nke Abụọ Abrahams jere ozi na Royal Air Force na England. Ka ọ na-erule n'etiti afọ ndị 1950 ọ chọtara ọkpụkpọ ya dị ka onye na-ese ihe gbasara okpkpe.

National Gallery nke Jamaica kwuru banyere usoro ihe osise iri abụọ nke "Mmasị nke Kraịst" na "mmetụta nsọpụrụ nke ezi onye kwere ekwe gosipụtara Abrahams dị ka Jamaica na onye na-ese ihe okpukpe kachasị mma na Caribbean".

Abrahams bụ Onye Kraịst na-anụ ọkụ n'obi na ọtụtụ n'ime ọrụ ndị na-agba gburugburu Isiokwu okpukpe na izi ezi a na-apụghị ịgbagha agbagha, ihe osise ndị dị ka Nri Anyasị Ikpeazụ na-egosi ikike Abraham nwere ịgbakwunye ihe ndị dị ugbu a na ntụgharị na ilu okpukpe. [2]

E nyere ya ihe nrite ọla edo Musgrave maka ọrụ ya site n'aka Institute of Jamaica na afọ otụ pụkụ nari itolu na iri asatọ na asaa 1987. [3]

N'afọ ikpeazụ ya hụrụ ọganihu ọhụrụ ole na ole n'ụdị ya ma ọ na-ekwughachi ma ọ bụ mepụta ọdịiche dị iche iche n'ọtụtụ ihe osise mbụ ya. Abrahams kọwara onwe ya dị ka onye mba ụwa ma ndị ọzọ weere ya dị ka "nwa amaala ụwa".[4] Abrahams nwụrụ n'udo n'ụlọ ya n'afọ pụkụ abụọ na ise n'ihi ọrịa kansa na akpụ ụbụrụ.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • Nri Anyasị Ikpeazụ
  • Mbibi nke Port Royal
  • Nwaanyị M ga-abụ Banyere Azụmaahịa Nna m
  • Adam na Iv
  • Ndị Izrel Iri na Atọ
  • Ihe ngosi Henry Ford
  • Pan na ndị na-agụ egwú ya
  • Onye Ozizi n'azụ ụlọ
  • Aka Columbus
  • Nrịgo
  • Hallelujah
  • "Nwanyị Afro Jew"

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • Ihe nrite Royal Air Force (RAF)
  • Ihe nrite New York Critics
  • Ihe nrite ọlaọcha nke ụlọ ọrụ Jamaica
  • Usoro nke Ịdị iche (Jamaica)
  • Gold Musgrave Medal nke The Institution of Jamaica (1987)

Ebem si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Issue 75 (1 September 2005). Father Carl Abrahams.
  2. Boxer, D. (1 January 2003). Abrahams, Carl. Grove Art Online. Ed. Retrieved 22 April 2019
  3. Musgrave Awardees. Institute of Jamaica. Archived from the original on 18 October 2014. Retrieved on 6 February 2015.
  4. Wardle (13 July 2015). "The artist Carl Abrahams and the cosmopolitan work of centring and peripheralizing the self⋆". Journal of the Royal Anthropological Institute 21 (4): 803–819. DOI:10.1111/1467-9655.12288. 

Ọgụgụ ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Annie Paul Nna Carl Abrahams. Mbipụta 75 (September/October 2005) Caribbean Beat Magazine
  • Veerle Poupeye Caribbean Art. London; Thames na Hudson; 1998.